Skip to main content

EKPERE NDIGBO

Ndigbo kwenu, Ndigbo kwenu, Ndigbo kwezue nu ooo….
Agupee uzo, agupee onu.
Elu rie, Ala rie.
Ndu mmiri, ndu azu, mmiri atala, Azu anwula.
Ya diri onye ihu mma, dikwara onye azu mma.
Onye shiri ihe oshiri, ya zere.
Egbe bere, ugo bere, nke si ibe ya ebela, nku kwakwaa ya.
Oji ofor ga ala.
Ihe ogu gburu ka ofo n’eri.
Onye huru anyi wee bido tuwa ogu ojo, anyi si ogu ya gbalaa ya n’isi.
Onye isi anyi na awa aja, ya jiri nke ya chua ya.
Emerem gini bu isi-ogu.
Ofo gburuji, ofo gbue ede, mana emerem gini gburu ofor.
Onye dewere isi nke ya, na acho isi onye ozo, ga atufu nke ya.
Oga adiri anyi mma n’ubochi eke; oga adiri anyi mma n’ ubochi orie; oga adiri anyi mma n’ubochi afor, oga adikwuru anyi mma na ubochi nkwo.
Anyi ga adi ka echi, maka na echi adighi agwu-agwu.
Ubochi uzo na ekpo-oku;ukwu agaghi eli anyi oto.
 Ona eme n’ihu, anyi ga ano n’azu, ona emekwa na azu, anyi ga ano n’ihu.
Oku n’ agba; nwa-awo ana awuli elu.
Onye n’achu nwa-okuko mwe ada, nwa-okuko nwe mwe-mwe oso.
Nwanyi huru anyi cheta nwa ya nwuru-anwu, anyi si ka onwu gburu nwa ya gbukwue ya.
Anu huru anyi bido ipu mpi, anyi ga ejiri mpi ya nuo mmanya.
Igbo bu Igbo, oga adiri unu n’mma.

Comments

http://go.onclasrv.com/afu.php?zoneid=1476968